1 Chronicles 8

Usoro ọmụmụ Sọl

1Benjamin mụtara ụmụ ndị ikom ise. Aha ha nʼusoro dịka e si mụọ ha bụ:
Bela nke mbụ,
nke abụọ Ashbel, nke atọ Ahara,
2nke anọ Noha, na nke ise Rafa.
3Ndị ikom Bela mụrụ bụ
Aada, Gera, Abihud,
4Abishua, Neeman, Ahoa, 5Gera, Shefufan na Huram.
6Ụmụ Ehud ndị bụ ndịisi ezinaụlọ na Geba, ndị bụkwa ndị e si na Geba chụpụ mee ka ha gaa biri na Manahat bụ ndị a:
7Neeman, Ahija na Gera, onye chụpụrụ ha na onye bụkwa nna Ụza na Ahihud.
8A mụtara Shaharaim ụmụ ndị ikom na Moab mgbe ọ gbachara ndị nwunye ya abụọ bụ Hushim na Baara alụkwaghị m. 9Nwunye ya Hodesh mụtara Jobab, Zibịa, Mesha, Malkam, 10Jeuz, Sakia na Miama. Ndị a bụ ụmụ ya ndị ikom, ndị bụkwa ndịisi ezi. 11Tupu ọ chụpụ nwunye ya Hushim, ọ mụtaara ya Abaịtub, na Elpaal.
12Elpaal mụrụ ndị a:
Eba, Misham, Shemed (onye wuru obodo Ono na Lod, na obodo nta gbara ha gburugburu).
13Ụmụ ya ndị ọzọ bụ Beriya, na Shema, ndị bụ ndịisi ezinaụlọ ndị bi nʼAijalon. Ọ bụ ha chụpụrụ ndị Gat site nʼobodo ahụ.
14Beriya mụrụ Ahio, Shashak, Jeremot, 15Zebadaya, Arad, Eda, 16Maikel, Ishpa na Joha, ndị a bụ ụmụ ndị ikom Beriya.
17Zebadaya, Meshulam, Hizki, Heba, 18Ishmerai, Izlaya na Jobab bụ ụmụ Elpaal.
19Jakim, Zikri, Zabdi, 20Elienai, Ziletai, Eliel, 21Adaya, Beraya na Shimrat bụ ụmụ Shimei.
22Ishpan, Eba, Eliel, 23Abdon, Zikri, Hanan, 24Hananaya, Elam, Antotija, 25Ifdeya na Penuel bụ ụmụ ndị ikom Shashak.
26Jeroham mụrụ Shamsherai, Sheharaya, Atalaya, 27Jaareshaya, Ịlaịja na Zikri bụ ụmụ ndị ikom Jeroham.
28Ndị a niile bụ ndịisi ezi, ndị ndu, ndị bi na Jerusalem, ndị e depụtara aha ha nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ.

29Jeiel nna Gibiọn biri na Gibiọn.
Aha nwunye ya bụ Maaka.
30Ọ mụrụ Abdon, ọkpara ya, Zua, Kish, Baal, Nea, Nadab, 31Gedoa, Ahio na Zeka 32na Miklot, onye bụ nna Shimea. Ha onwe ha bikwa ndị ụmụnna ha nso na Jerusalem.
33Nea mụrụ Kish, nna Sọl. Ma Sọl mụrụ Jonatan, Malkishua, Abinadab na Esh-Baal.
34Jonatan mụrụ nwa nwoke
a na-akpọ Merib-Baal, nna Maịka.
35Ụmụ Maịka mụrụ bụ,
Piton, Melek, Tarea na Ehaz.
36Ehaz amụọ Jehoada nna Alemet, Azmavet na Zimri. Zimri mụrụ Moza. 37Moza mụrụ Binea, nna Rafa, nna Eleasa, nna Azel.
38Azel mụrụ ụmụ ndị ikom isii ndị a:
Azrikam, Bokeru, Ishmel, Shearaya, Ọbadaya na Hanan. Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Azel.
39Eshek nwanne nwoke Azel mụrụ ndị ikom atọ:
Ụlam, ọkpara ya na Jeush, na Elifelet.
40Ụmụ Ụlam bụ dike na dimkpa ndị a zụrụ ịgba ụta. Ọnụọgụgụ ụmụ ha na ụmụ ụmụ ha dị otu narị na iri mmadụ ise, 150.
Ha niile sikwa nʼebo Benjamin.
Copyright information for IboBIU